ABÙ ỌMA 103:1-18
ABÙ ỌMA 103:1-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYị; echefukwala mmeso ọma ya niile, ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo. ONYENWE ANYị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu. O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche: ONYENWE ANYị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta; ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ. Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka ONYENWE ANYị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja. Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa, ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya. Ma ịhụnanya ONYENWE ANYị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha, nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
ABÙ ỌMA 103:1-18 Bible Nso (IGBOB)
Gọzie Jehova, nkpuru-obim; Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya. Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi: Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile; Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi; Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche: Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo. Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕u Ezi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe. Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile, Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile. Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere. Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu; Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe. Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi. N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa, Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya. Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ. Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya, Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya. N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi; Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu. Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di; Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko. N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi; Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ. Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya, Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu; Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya, Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha.