Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYị; echefukwala mmeso ọma ya niile, ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo. ONYENWE ANYị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu. O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche: ONYENWE ANYị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta; ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ. Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka ONYENWE ANYị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja. Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa, ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya. Ma ịhụnanya ONYENWE ANYị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha, nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
Gụọ Abụ Ọma 103
Geere nke a ntị Abụ Ọma 103
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 103:1-18
5 Ụbọchị
Echiche Akwụkwọ Nsọ banyere Abụ Ọma 103:1-5. A dụrụ anyị ọdụ ka anyị jiri ihe niile dị n'ime anyị gọzie Onyenwe anyị, ebe anyị maara na ọ na-azọpụta, na-agwọ ọrịa, na-eweghachi ma na-eme ka ndụ anyị dị ọhụrụ.
Ụbọchị 7
Ị nọghịcha n'ọnụ na ụwa? Na ọnwa 7 na-akpọ ihe na-eme ihe gbasara iji nweta nkwado ịgụ ụbọchị gbasara Kristi niile n'ime gbasara
7 Days
What would happen if you woke up and reminded yourself of the Gospel every day? This 7-day devotional seeks to help you do just that! The Gospel not only saves us, it also sustains us throughout our lives. Author and Evangelist Matt Brown has formed this reading plan based on the 30-day devotional book written by Matt Brown and Ryan Skoog.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị