ILU 9:1-6
ILU 9:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa. O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya. O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị, “Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị, “Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara. Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.”
ILU 9:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Amam-ihe ewuwo ulo-ya, Ọ waputawo ogidi asa ya: O b͕uwo anu-ob͕ub͕u-ya; ọ gwawo manya-vine-ya agwa; O dowo kwa table-ya n'usoro. O zipuwo umu-ab͕ọghọ-ya, ọ nākpọ òkù N'elu ebe nile di elu nke obodo, si, Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a: Onye obi amam-ihe kọrọ, amam-ihe asiwo ya, Bianu, rienu nrim ufọdu, Ṅu-kwa-nu manya-vine ufọdu nke m'gwaworo agwa. Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu; Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta.