Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa. O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya. O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị, “Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị, “Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara. Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.”
Gụọ Ilu 9
Geere nke a ntị Ilu 9
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 9:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị