Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 9

9
1Amam-ihe ewuwo ulo-ya,
Ọ waputawo ogidi asa ya:
2O b͕uwo anu-ob͕ub͕u-ya; ọ gwawo manya-vine-ya agwa;
O dowo kwa table-ya n'usoro.
3O zipuwo umu-ab͕ọghọ-ya, ọ nākpọ òkù
N'elu ebe nile di elu nke obodo, si,
4Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a:
Onye obi amam-ihe kọrọ, amam-ihe asiwo ya,
5Bianu, rienu nrim ufọdu,
Ṅu-kwa-nu manya-vine ufọdu nke m'gwaworo agwa.
6Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu;
Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta.
7Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì:
Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya.
8Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì:
Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya.
9Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari:
Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya.
10Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu:
Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta.
11N'ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba,
Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu.
12Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe:
Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya.
13Nwanyi nzuzu nēme nkpọtu;
Onye nēnweghi uche ka ọ bu, ọ maghi kwa ihe ọ bula.
14Ọ nānọdu kwa n'ọnu-uzọ ulo-ya,
N'elu oche n'ebe nile di elu nke obodo,
15Ikpọ ndi nāgabiga n'uzọ òkù,
Bú ndi nāgazi agazi n'okporo-uzọ-ha,
16Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a:
Ọzọ, onye obi amam-ihe kọrọ, nwanyi ahu asiwo ya,
17Miri ezutara ezuta nātọ utọ,
Nri eriri na nzuzo di utọ.
18Ma nwoke ahu amaghi na ndi nādighi ndu nọ n'ebe ahu;
Na ọ bu n'ebe nile miri emi nke ala-mọ ka ndi ọ kpọrọ nọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 9: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara