Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 8

8
1Amam-ihe, ọ̀ dighi-akpọ òkù?
Nghọta kwa, ọ̀ dighi-eme ka olu-ya da udà?
2N'elu ebe nile di elu n'akuku uzọ,
N'ab͕ata uzọ nile, ka O guzoworo onwe-ya;
3N'akuku ọnu-uzọ-ama nile, n'ọnu amá obodo,
Na nbata ọnu-uzọ nile, ka ọ nētisi nkpu ike, si,
4Ọ bu unu, madu, ka m'nākpọku;
Olum nādaku kwa umu madu.
5Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche;
Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe.
6Nurunu, n'ihi na isi ihe di iche iche ka m'nēkwu;
Nsaghe eb͕ub͕ere-ọnum gābu kwa ihe di iche iche ziri ezi.
7N'ihi na ezi-okwu ka okpo-ọnum nēkwu dika onye nātughari uche;
Ọzọ, ihe-árú nke eb͕ub͕ere-ọnum ka nmebi-iwu bu.
8N'ezi omume ka okwu nile nke ọnum di;
Ọ dighi ihe nēzighi ezi ma-ọbu ihe b͕agọrọ ab͕agọ di nime ha.
9Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ,
Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ.
10Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha;
Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa.
11N'ihi na amam-ihe di nma kari ruby;
Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya.
12Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim,
Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m'nāchọputa.
13Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì:
Npako, na nganga, na uzo ọjọ,
Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.
14Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe:
Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike.
15Mu ka ndi-eze ji abu eze,
Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume.
16Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi,
Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa.
17Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya;
Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam.
18Àkù na nsọpuru di n'akam;
E, àkù nke nādigide na ezi omume.
19Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha;
Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa.
20N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije,
N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:
21Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi,
Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha.
22Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya,
Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu.
23Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu,
Tutu uwa adi.
24Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram;
Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri.
25Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala,
Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram:
26Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo,
Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi.
27Mb͕e O doziri elu-igwe, n'ebe ahu ka m'nọ:
Mb͕e O nyere ukpuru, si, Ka ihe b͕ara buruburu dikwasi n'iru ob͕u-miri:
28Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n'elu:
Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike:
29Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya,
Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya:
Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru:
30Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà:
M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi,
Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile;
31Nēgwuri egwú n'elu-uwa dum madu bi n'uwa-Ya;
Ihe nātọm utọ di kwa n'ebe umu madu nọ.
32Ma ub͕u a, umum, genum nti:
N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.
33Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe,
Unu eze-kwa-la ya ndu.
34Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu,
N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi,
Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.
35N'ihi na onye nāchọtam achọtawo ndu,
Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.
36Ma onye nēmehie megidem nēme nkpuru-obi-ya ihe-ike:
Ndi nile nke nākpọm asì nāhu ọnwu n'anya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara