ILU 8:14-26
ILU 8:14-26 Bible Nso (IGBOB)
Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe: Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike. Mu ka ndi-eze ji abu eze, Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume. Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi, Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa. Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya; Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam. Àkù na nsọpuru di n'akam; E, àkù nke nādigide na ezi omume. Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha; Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa. N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije, N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé: Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi, Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha. Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya, Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu. Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu, Tutu uwa adi. Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram; Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri. Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala, Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram: Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo, Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi.
ILU 8:14-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike. Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi. Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa. Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m. Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume. Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo. Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi. Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha. “ONYENWE ANYị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ. Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa. Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa, tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta. E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.