Ilu 8:14-26
Ilu 8:14-26 BIU
Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike. Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi. Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa. Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m. Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume. Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo. Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi. Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha. “ONYENWE ANYị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ. Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa. Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa, tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta. E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.

