ILU 24:1-22
ILU 24:1-22 Bible Nso (IGBOB)
Ekwosola ndi ọjọ ekworo, Achọsi-kwa-la ike inọ n'etiti ha: N'ihi na ipunara-madu-ihe ka obi-ha nātughari, Okwu nmeb͕u ka eb͕ub͕ere-ọnu-ha nēkwu. Amam-ihe ka eji ewu ulo; Ọ bu kwa nghọta ka eji eme ka o guzosie ike: Site kwa n'ihe-ọmuma ka ime-ulo-ya nile nējuputa N'àkù nile di oké ọnu-ahia di kwa utọ. Onye mara ihe di ike; E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume. N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha: Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu. Amam-ihe adikara onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ elu: Ọ dighi-asaghe ọnu-ya n'ọnu-uzọ-ama. Onye nēchè ime ihe ọjọ, Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile. Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie: Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu. Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu, Ike-gi pere npe. Naputa ndi anāchigara ọnwu, Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha. Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a: Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta? Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama? Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di? Nwam, racha manu-aṅu, n'ihi na ọ di nma; Ya na manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi, nke nātọ okpo-ọnu-gi utọ: Mara na otù a ka amam-ihe diri nkpuru-obi-gi: Ọ buru na i chọtawo ya, ọdi-n'iru gādi kwa, Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi. Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume; Apunarala ya ebe-izu-ike-ya: N'ihi na ub͕ò asa ka onye ezi omume nāda, bili kwa ọzọ: Ma ndi nēmebi iwu nāsu ngọngọ n'ihe ọjọ. Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda, Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ: Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n'anya-Ya, O we me ka iwe-Ya si n'aru ya laghachi. Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ; Ekwosola ndi nēmebi iwu ekworo. N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu. Nwam, tua egwu Jehova na eze: Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo: N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili; Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya?
ILU 24:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ekwosola ndị ajọ omume ekworo, ka ihe banyere ha ghara ịtọ gị ụtọ. Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike, egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara. Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike. Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya, bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa. Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike, ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha. Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ, nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị. Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu, ha gaghị asaghe ọnụ ha nʼọgbakọ ọnụ ụzọ ama. Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie, ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị. Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu, ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị. Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ. Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi. Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,” ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya? Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya? Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị? Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ. Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ. Ọ bụrụ na i chọta ya i nwere olileanya nke ga-adịgide. Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume. A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya. Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ. Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha. Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu. Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara. Nʼihi na ONYENWE ANYị pụrụ iwe iwe nʼihi ya megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ. Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ. Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume. Nwa m, tụọ egwu ONYENWE ANYị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu. Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?