Ekwosola ndị ajọ omume ekworo, ka ihe banyere ha ghara ịtọ gị ụtọ. Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike, egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara. Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike. Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya, bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa. Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike, ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha. Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ, nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị. Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu, ha gaghị asaghe ọnụ ha nʼọgbakọ ọnụ ụzọ ama. Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie, ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị. Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu, ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị. Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ. Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi. Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,” ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya? Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya? Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị? Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ. Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ. Ọ bụrụ na i chọta ya i nwere olileanya nke ga-adịgide. Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume. A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya. Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ. Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha. Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu. Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara. Nʼihi na ONYENWE ANYị pụrụ iwe iwe nʼihi ya megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ. Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ. Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume. Nwa m, tụọ egwu ONYENWE ANYị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu. Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?
Gụọ Ilu 24
Geere nke a ntị Ilu 24
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 24:1-22
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo