Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 21:1-16

ILU 21:1-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka ONYENWE ANYị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma. Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, ma ONYENWE ANYị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile. Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka ONYENWE ANYị na-anabata karịa ịchụ aja. Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie. Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru, dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ. Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide, ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ. Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma, ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi. Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ, ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi. Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu. Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ; ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere. Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe, ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma. Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi. Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye, ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya. Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ, otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ. Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi, ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe. Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ.

ILU 21:1-16 Bible Nso (IGBOB)

Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n'aka Jehova: N'ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya. Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua: Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu. Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe Bu ihe Jehova nārọputa kari àjà. Anya npako na obi di nganga, Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie. Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù: Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ. Ikpa àkù site n'ire okwu-ugha Bu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu. Ipunara-madu-ihe nke ndi nēmebi iwu gēkpochapu ha; N'ihi na ha juru ime ihe ekpere n'ikpe. Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu: Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi. Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù. Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike: Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya. Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe: Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma. Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu; Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha. Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike, Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya. Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe, Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike. Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe; Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe. Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu, Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.