Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka ONYENWE ANYị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma. Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, ma ONYENWE ANYị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile. Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka ONYENWE ANYị na-anabata karịa ịchụ aja. Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie. Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru, dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ. Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide, ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ. Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma, ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi. Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ, ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi. Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu. Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ; ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere. Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe, ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma. Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi. Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye, ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya. Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ, otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ. Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi, ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe. Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ.
Gụọ Ilu 21
Geere nke a ntị Ilu 21
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 21:1-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo