ỌNU-ỌGUGU 26:1-11
ỌNU-ỌGUGU 26:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ihe otiti ahụ niile gasịrị, ONYENWE ANYị gwara Mosis na Elieza nwa Erọn, onye nchụaja okwu sị ha, “Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.” Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha, “Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka ONYENWE ANYị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta: Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a: site na Hanok, ikwu Hanok, site na Palu, ikwu Palu, site na Hezrọn, ikwu Hezrọn site na Kami, ikwu Kami Ndị a bụ agbụrụ Ruben. Ọnụọgụgụ ha dị iri puku anọ, puku atọ na narị asaa na iri atọ (43,730). Nwa Palu bụ Eliab, ụmụ Eliab bụ Nemuel, Datan na Abiram. Datan na Abiram bụ ndị ndu ọgbakọ ahụ nupuru isi megide Mosis na Erọn. Ha sonyere ndị ahụ so Kora mgbe ha nupuru isi megide ONYENWE ANYị. Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị. Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị.
ỌNU-ỌGUGU 26:1-11 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e ihe-otiti ahu gasiri, na Jehova gwara Moses na Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, okwu, si, Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha n'Israel. Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we kpayere ha uka n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si, Gutanu ọnu-ọgugu ndi Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru; dika Jehova nyere Moses na umu Israel iwu, bú ndi nēsi n'ala Ijipt puta. Reuben, bú ọkpara Israel: umu-ndikom Reuben; nke Hanok bu ab͕uru ndi Hanok: nke Palu bu ab͕uru ndi Palu: nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Kami bu ab͕uru ndi Kami. Ndia bu ab͕uru ndi Reuben: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iteghete, na ọgu isi, na iri. Umu ndikom Palu kwa; Eliab. Umu-ndikom Eliab; Nemuel, na Detan, na Abairam. Ndia bu Detan ahu na Abairam ahu, ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi lusoro Moses, luso kwa Eron, ọ̀gù nime nzukọ Kora, mb͕e ha lusoro Jehova ọ̀gù: ala we saghe ọnu-ya, loda ha na Kora, mb͕e nzukọ ahu nwuru; mb͕e ọku ahu ripiara ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu, ha we ghọ ihe-iriba-ama. Ma umu-ndikom Kora anwughi.