Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 26

26
1O rue, mb͕e ihe-otiti ahu gasiri, na Jehova gwara Moses na Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, okwu, si, 2Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha n'Israel. 3Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we kpayere ha uka n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si, 4Gutanu ọnu-ọgugu ndi Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru; dika Jehova nyere Moses na umu Israel iwu, bú ndi nēsi n'ala Ijipt puta.
5Reuben, bú ọkpara Israel: umu-ndikom Reuben; nke Hanok bu ab͕uru ndi Hanok: nke Palu bu ab͕uru ndi Palu: 6nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Kami bu ab͕uru ndi Kami. 7Ndia bu ab͕uru ndi Reuben: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iteghete, na ọgu isi, na iri. 8Umu ndikom Palu kwa; Eliab. 9Umu-ndikom Eliab; Nemuel, na Detan, na Abairam. Ndia bu Detan ahu na Abairam ahu, ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi lusoro Moses, luso kwa Eron, ọ̀gù nime nzukọ Kora, mb͕e ha lusoro Jehova ọ̀gù: 10ala we saghe ọnu-ya, loda ha na Kora, mb͕e nzukọ ahu nwuru; mb͕e ọku ahu ripiara ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu, ha we ghọ ihe-iriba-ama. 11Ma umu-ndikom Kora anwughi.
12Umu-ndikom Simeon, dika agburu nile ha si di: nke Nemuel bu ab͕uru ndi Nemuel: nke Jamin bu ab͕uru ndi Jamin: nke Jakin bu ab͕uru ndi Jakin: 13nke Zera bu ab͕uru ndi Zera: nke Shaul bu ab͕uru ndi Shaul. 14Ndia bu ab͕uru ndi Simeon, orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-ise, na ọgu iri.
15Umu-ndikom Gad, dika ab͕uru nile ha si di: nke Zefon bu ab͕uru ndi Zefon: nke Hagi bu ab͕uru ndi Hagi: nke Shuni bu ab͕uru ndi Shuni: 16nke Ọzni bu ab͕uru ndi Ọzni: nke Iri bu ab͕uru ndi Iri: 17nke Arod bu ab͕uru ndi Arod: nke Areli bu ab͕uru ndi Areli. 18Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Gad, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ ise, na nnu, na ọgu ise.
19Umu-ndikom Juda, Ia na Onan: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. 20Umu-ndikom Juda, dika ab͕uru nile ha si di, bu; nke Shila bu ab͕uru ndi Shila: nke Perez bu ab͕uru ndi Perez: nke Zera bu ab͕uru ndi Zera. 21Umu-ndikom Perez bu kwa; nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Hamul bu ab͕uru ndi Hamul. 22Ndia bu ab͕uru Juda, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ iteghete, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise.
23Umu-ndikom Isaka, dika ab͕uru nile ha si di: nke Tola bu ab͕uru ndi Tola: nke Puva bu ab͕uru ndi-Punait: 24nke Jashub bu ab͕uru ndi Jashub: nke Shimron bu ab͕uru ndi Shimron. 25Ndia bu ab͕uru Isaka, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asatọ, na ọgu iri-na-ise.
26Umu-ndikom Zebulun, dika ab͕uru nile ha si di: nke Sered bu ab͕uru ndi Sered: nke Ilon bu ab͕uru ndi Ilon: nke Jahleel bu ab͕uru ndi Jahleel. 27Ndia bu ab͕uru ndi Zebulun, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise.
28Umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di: Manase na Efraim. 29Umu-ndikom Manase: nke Makia bu ab͕uru ndi Makia: Makia we muta Gilead: nke Gilead bu ab͕uru ndi Gilead. 30Ndia bu umu-ndikom Gilead: nke Ieza bu ab͕uru ndi Ieza: nke Hilek bu ab͕uru ndi Hilek. 31nke Asriel bu ab͕uru ndi Asriel: nke Shekem bu ab͕uru ndi Shekem: 32nke Shemida bu ab͕uru ndi Shemida: nke Hefa bu ab͕uru ndi Hefa. 33Ma Zelọfehad nwa Hefa enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: aha umu-ndinyom Zelọfehad bu Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza. 34Ndia bu ab͕uru Manase: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-otù, na ọgu iri-na-ise.
35Ndia bu umu-ndikom Efraim, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shutela bu ab͕uru ndi Shutela: nke Beka bu ab͕uru ndi Beka: nke Tahan bu ab͕uru ndi Tahan. 36Ndia bu umu-ndikom Shutela: nke Iran bu ab͕uru ndi Iran. 37Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Efraim, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ anọ, na nnù, na ọgu ise. Ndia bu umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di.
38Umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: nke Bela bu ab͕uru ndi Bela: nke Ashbil bu ab͕uru ndi Ashbil: nke Ahairam bu ab͕uru ndi Ahairam: 39nke Shefufan bu ab͕uru ndi-Shufamait: nke Hufan bu ab͕uru ndi Hufan. 40Umu-ndikom Bela bu Ad na Neaman: nke Ad bu ab͕uru ndi Ad: nke Neaman bu ab͕uru ndi Neaman. 41Ndia bu umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-anọ.
42Ndia bu umu-ndikom Dan, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shuham bu ab͕uru ndi Shuham. Ndia bu ab͕uru nke Dan, dika ab͕uru nile ha si di. 43Ab͕uru nile nke ndi Shuham, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, di orú nnù uzọ asatọ, na otù nnù.
44Umu-ndikom Asha, dika ab͕uru nile ha si di: nke Imna bu ab͕uru ndi Imna: nke Ishvi bu ab͕uru ndi Ishvi: nke Beria bu ab͕uru ndi Beria. 45Nke umu-ndikom Beria: nke Hiba bu ab͕uru ndi Hiba: nke Malkiel bu ab͕uru ndi Malkiel. 46Ma aha nwa-nwayi Asha bu Sera. 47Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Asha, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri.
48Umu-ndikom Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: nke Jahzeel bu ab͕uru ndi Jahzeel: nke Guni bu ab͕uru ndi Guni: 49nke Jiza bu ab͕uru ndi Jiza: nke Shilem bu ab͕uru ndi Shilem. 50Ndia bu ab͕uru Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri.
51Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, orú nnù ogu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù anọ, na ọgu isi, na iri.
52Jehova we gwa Moses okwu, si, 53Ndia ka agēkere ala ahu n'ihe-nketa, n'ọnu-ọgugu aha. 54Ndi bara uba ka i gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà; agēnye nwoke ọ bula ala-nketa-ya, dika ndi-ya agukọtara agukọta si di. 55Nání ọ bu n'ife-nzà ka agēkè ala ahu: dika aha nile nke ebo nile nke ndi bu nna-ha si di ka ha gēketa. 56Dika ife-nzà si di ka agēkè ihe-nketa-ha n'etiti ndi bara uba na ndi di ole-na-ole.
57Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ndi Livai dika ab͕uru nile ha si di: nke Giashon bu ab͕uru ndi Giashon: nke Kohat bu ab͕uru ndi Kohat: nke Merari bu ab͕uru ndi Merari. 58Ndia bu ab͕uru Livai: ab͕uru ndi Libni, ab͕uru ndi Hebron, ab͕uru ndi Mahli, ab͕uru ndi Mushi, ab͕uru ndi Kora. Kohat we mua Amram. 59Aha nwunye Amram bu Jokebed, nwa Livai, nke amuru ya nye Livai n'Ijipt: nwayi ahu we muara Amram Eron na Moses, na Miriam, bú nwa-nne-ha nwayi. 60Amu-kwa-ra nye Eron Nebad na Abaihu na Eleeza na Itama. 61Nedab na Abaihu we nwua mb͕e ha wetara nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ. 62Ndi-ha agukọtara agukọta di orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru: n'ihi na agukọtaghi ha n'etiti umu Israel, n'ihi na enyeghi ha ihe-nketa n'etiti umu Israel.
63Ndia bu ndi Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko. 64Ma n'etiti ndia ọ dighi nwoke ọ bula di sitere na ndi Moses na Eron, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n'ọzara Sainai. 65N'ihi na Jehova kwuru okwu bayere ha, si, Ha aghaghi inwu n'ọzara nka. Ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nime ha, ma-ọbughi nání Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌNU-ỌGUGU 26: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara