Mgbe ihe otiti ahụ niile gasịrị, ONYENWE ANYị gwara Mosis na Elieza nwa Erọn, onye nchụaja okwu sị ha, “Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.” Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha, “Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka ONYENWE ANYị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta: Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a: site na Hanok, ikwu Hanok, site na Palu, ikwu Palu, site na Hezrọn, ikwu Hezrọn site na Kami, ikwu Kami Ndị a bụ agbụrụ Ruben. Ọnụọgụgụ ha dị iri puku anọ, puku atọ na narị asaa na iri atọ (43,730). Nwa Palu bụ Eliab, ụmụ Eliab bụ Nemuel, Datan na Abiram. Datan na Abiram bụ ndị ndu ọgbakọ ahụ nupuru isi megide Mosis na Erọn. Ha sonyere ndị ahụ so Kora mgbe ha nupuru isi megide ONYENWE ANYị. Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị. Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị.
Gụọ Ọnụọgụgụ 26
Geere nke a ntị Ọnụọgụgụ 26
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ọnụọgụgụ 26:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị