Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 15:1-16

ỌNU-ỌGUGU 15:1-16 Bible Nso (IGBOB)

Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala ebe-obibi nile unu, nke Mu onwem nēnye unu, mb͕e unu gēme kwa àjà-ọku ichuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu n'onyinye-afọ-ofufo, ma-ọbu na mb͕e nile unu akara àkà, ime ihe ísì utọ isurere Jehova, sitere n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu: onye ahu nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma, bú otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu: manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin, tiyere àjà-nsure-ọku ahu, ma-ọbu iji chu àjà ọzọ ahu, ka i gēdoziri otù nwa-aturu. Ma-ọbu n'ichu ebulu n'àjà, i gēdozi onyinye-inata-iru-ọma, uzọ abua n'uzọ iri nke otù ephah utu ọku flour agwara n'otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin nke manu. Manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, ka i gēweta kwa nso, ka ọ buru ihe ísì utọ isurere Jehova. Ọzọ, mb͕e i nēme nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu ichu àjà-udo anāchuru Jehova: ọ gēweta kwa nso, tiyere nwa-oke-ehi ahu, onyinye-inata-iru-ọma, bú uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara na nkera hin nke manu. Manya-vine ka i gēweta kwa nso iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, nkera hin, ka ọ buru àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova. Otú a ka agēmere otù oke-ehi, ma-ọbu otù ebulu, ma-ọbu otù nwa nime aturu ma-ọbu nime ewu. Dika ọnu-ọgugu ihe nke unu nēdozi si di, otú a ka unu gēmere ihe ọ bula dika ọnu-ọgugu-ha si di. Onye ọ bula amuru n'ala gēme ihe ndia otú a, n'iweta nso àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova. ọzọ mb͕e ọbìa nọ n'ala-unu dika ọbìa, ma-ọbu onye ọ bula nọ n'etiti unu rue ọb͕ọ nile unu, mb͕e ọ gēme àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova; dika unu si eme, otú a ka ọ gēme. Nime nkpọkọta nka, otù ukpuru diri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa, bú ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu: dika unu si di, otú a ka ọbìa ahu gādi n'iru Jehova. Otù iwu na otù ikpé gādiri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa n'ala-unu.

ỌNU-ỌGUGU 15:1-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu batara ala ahụ m na-enye unu dịka ụlọ unu, ọ bụrụ na unu echee nʼihu ONYENWE ANYị aja nsure ọkụ nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYị, maọbụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ nke si nʼigwe ewu na atụrụ, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ndị ọzọ, maka imezu nkwa pụrụ iche maọbụ onyinye afọ ofufu, maọbụ aja mmemme. Onye wetara onyinye a aghaghị iweta nʼihu ONYENWE ANYị aja mkpụrụ ọka nke bụ ezi ụtụ ọka ruru lita abụọ nke e ji mmanụ ruru otu lita gwakọtaa. Ọ ga-eweta otu lita mmanya dịka onyinye ihe ọṅụṅụ maka nwa atụrụ ọbụla e ji chụọ aja nsure ọkụ maọbụ aja ụzọ. “ ‘Ọ bụrụ nwa ebule ka e ji achụ aja ahụ, weta lita ezi ụtụ ọka anọ na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ jitụ ntakịrị karịa otu lita, tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYị. “ ‘Mgbe i ji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, maọbụ aja imezu nkwa, maọbụ aja udo nye ONYENWE ANYị, tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ. Wetakwa lita mmanya abụọ nke ga-abụ onyinye ihe ọṅụṅụ. Ọ ga-abụ onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYị. Nke a bụ usoro a ga-agbaso nʼoge ọbụla e ji nwa oke ehi, maọbụ nwa ebule, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ nwa ewu chụọ aja. Meenụ ya maka anụ ụlọ ọbụla nʼoge niile ọbụla unu na-achụ aja. “ ‘Onye ọbụla bụ nwa afọ ala aghaghị ime ihe ndị a mgbe ọbụla o wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye dịka onyinye isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYị. Nʼọgbọ niile na-abịa, mgbe ọbụla onye ọbịa, maọbụ onye ọzọ bi nʼetiti unu wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYị, ọ ghaghị ịgbaso ụzọ a nye onyinye ya. Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu ONYENWE ANYị. Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’ ”