Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala ebe-obibi nile unu, nke Mu onwem nēnye unu, mb͕e unu gēme kwa àjà-ọku ichuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu n'onyinye-afọ-ofufo, ma-ọbu na mb͕e nile unu akara àkà, ime ihe ísì utọ isurere Jehova, sitere n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu: onye ahu nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma, bú otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu: manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin, tiyere àjà-nsure-ọku ahu, ma-ọbu iji chu àjà ọzọ ahu, ka i gēdoziri otù nwa-aturu. Ma-ọbu n'ichu ebulu n'àjà, i gēdozi onyinye-inata-iru-ọma, uzọ abua n'uzọ iri nke otù ephah utu ọku flour agwara n'otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin nke manu. Manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, ka i gēweta kwa nso, ka ọ buru ihe ísì utọ isurere Jehova. Ọzọ, mb͕e i nēme nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu ichu àjà-udo anāchuru Jehova: ọ gēweta kwa nso, tiyere nwa-oke-ehi ahu, onyinye-inata-iru-ọma, bú uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara na nkera hin nke manu. Manya-vine ka i gēweta kwa nso iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, nkera hin, ka ọ buru àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova. Otú a ka agēmere otù oke-ehi, ma-ọbu otù ebulu, ma-ọbu otù nwa nime aturu ma-ọbu nime ewu. Dika ọnu-ọgugu ihe nke unu nēdozi si di, otú a ka unu gēmere ihe ọ bula dika ọnu-ọgugu-ha si di. Onye ọ bula amuru n'ala gēme ihe ndia otú a, n'iweta nso àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova. ọzọ mb͕e ọbìa nọ n'ala-unu dika ọbìa, ma-ọbu onye ọ bula nọ n'etiti unu rue ọb͕ọ nile unu, mb͕e ọ gēme àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova; dika unu si eme, otú a ka ọ gēme. Nime nkpọkọta nka, otù ukpuru diri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa, bú ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu: dika unu si di, otú a ka ọbìa ahu gādi n'iru Jehova. Otù iwu na otù ikpé gādiri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa n'ala-unu.