ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu batara ala ahụ m na-enye unu dịka ụlọ unu, ọ bụrụ na unu echee nʼihu ONYENWE ANYị aja nsure ọkụ nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYị, maọbụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ nke si nʼigwe ewu na atụrụ, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ndị ọzọ, maka imezu nkwa pụrụ iche maọbụ onyinye afọ ofufu, maọbụ aja mmemme. Onye wetara onyinye a aghaghị iweta nʼihu ONYENWE ANYị aja mkpụrụ ọka nke bụ ezi ụtụ ọka ruru lita abụọ nke e ji mmanụ ruru otu lita gwakọtaa. Ọ ga-eweta otu lita mmanya dịka onyinye ihe ọṅụṅụ maka nwa atụrụ ọbụla e ji chụọ aja nsure ọkụ maọbụ aja ụzọ.
“ ‘Ọ bụrụ nwa ebule ka e ji achụ aja ahụ, weta lita ezi ụtụ ọka anọ na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ jitụ ntakịrị karịa otu lita, tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYị.
“ ‘Mgbe i ji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, maọbụ aja imezu nkwa, maọbụ aja udo nye ONYENWE ANYị, tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ. Wetakwa lita mmanya abụọ nke ga-abụ onyinye ihe ọṅụṅụ. Ọ ga-abụ onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYị. Nke a bụ usoro a ga-agbaso nʼoge ọbụla e ji nwa oke ehi, maọbụ nwa ebule, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ nwa ewu chụọ aja. Meenụ ya maka anụ ụlọ ọbụla nʼoge niile ọbụla unu na-achụ aja.
“ ‘Onye ọbụla bụ nwa afọ ala aghaghị ime ihe ndị a mgbe ọbụla o wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye dịka onyinye isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYị. Nʼọgbọ niile na-abịa, mgbe ọbụla onye ọbịa, maọbụ onye ọzọ bi nʼetiti unu wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYị, ọ ghaghị ịgbaso ụzọ a nye onyinye ya. Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu ONYENWE ANYị. Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’ ”