JOB 6:1-14
JOB 6:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Job zara sị: “A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ! Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri, nke mere okwu m ji ada ike ike. Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m; mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha; ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m. Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata, ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị? A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu, ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ? A jụrụ m ịmetụ ya aka, nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa. “O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ, na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya. Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m. Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ. “Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ? Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi? Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume? Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz? Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka, ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube? “Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.
JOB 6:1-14 Bible Nso (IGBOB)
Job we za, si, Biko, ka atùa nkpasu-iwem nke-ọma, Ka ha buli kwa nmebim n'ihe-ọtùtù n'otù! N'ihi na ub͕u a ọ di arọ́ kari ájá oké osimiri nile: N'ihi ya ka okwum nile sihieworo uzọ. N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem. Inyinya-ibu-ọhia, ò nēti nkpu n'elu ahihia ndu? Ma-ọbu ehi, ò nēti nkpu n'elu nri agwara agwara nye ya? Ànēri ihe nke nādighi utọ n'ire, ma nnú adighi ya? Ma-ọbu ùtọ di na nke di ọcha nime àkwá? Ihe nkpuru-obim nāju imetu, Ihe ndia di ka nrim nke mebiri emebi. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia; Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam! Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam; Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum. Nkasi-obim we nādiru ub͕u a; M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko: N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ. Gini bu ikem na m'gēche? Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo? Ọ̀ bu ike nkume ka ikem bu? Ma-ọbu anu-arum, ọ̀ bu ọla? Ọ̀ bughi na iye-akam adighi nimem? Na enupuwo kwa nzube-ihe n'ebe m'nọ? Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya; Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.