Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Job 6:1-14

Job 6:1-14 BIU

Mgbe ahụ, Job zara sị: “A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ! Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri, nke mere okwu m ji ada ike ike. Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m; mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha; ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m. Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata, ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị? A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu, ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ? A jụrụ m ịmetụ ya aka, nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa. “O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ, na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya. Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m. Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ. “Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ? Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi? Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume? Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz? Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka, ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube? “Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.