Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 6

6
1Job we za, si,
2Biko, ka atùa nkpasu-iwem nke-ọma,
Ka ha buli kwa nmebim n'ihe-ọtùtù n'otù!
3N'ihi na ub͕u a ọ di arọ́ kari ájá oké osimiri nile:
N'ihi ya ka okwum nile sihieworo uzọ.
4N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem,
Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu
Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.
5Inyinya-ibu-ọhia, ò nēti nkpu n'elu ahihia ndu?
Ma-ọbu ehi, ò nēti nkpu n'elu nri agwara agwara nye ya?
6Ànēri ihe nke nādighi utọ n'ire, ma nnú adighi ya?
Ma-ọbu ùtọ di na nke di ọcha nime àkwá?
7Ihe nkpuru-obim nāju imetu,
Ihe ndia di ka nrim nke mebiri emebi.
8Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia;
Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam!
9Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam;
Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.
10Nkasi-obim we nādiru ub͕u a;
M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko:
N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ.
11Gini bu ikem na m'gēche?
Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo?
12Ọ̀ bu ike nkume ka ikem bu?
Ma-ọbu anu-arum, ọ̀ bu ọla?
13Ọ̀ bughi na iye-akam adighi nimem?
Na enupuwo kwa nzube-ihe n'ebe m'nọ?
14Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya;
Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.
15Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi,
Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù;
16Nke nēji nji n'ihi ice,
Nke snow nēzó onwe-ya nime ha:
17Na mb͕e anēme ka ha di ọku ha tọb͕ọro n'efu:
Mb͕e ọ di ọku, ha tapuworo n'ọnọdu-ha.
18Ndi-ije nke uzọ-ha nēchighari onwe-ha;
Ha nārigo n'ebe tọb͕ọrọ n'efu, we la n'iyì.
19Ndi-ije nke Tima legidere anya,
Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha.
20Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi;
Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere.
21N'ihi na ub͕u a unu abughi ihe;
Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu.
22Ọ̀ bu na m'siri, Nyenum ihe?
Ma-ọbu, Nyenu ihe-iri-ngo n'ihim site n'àkù-unu?
23Ma-ọbu, Wepuganum n'aka onye-nkpab͕u?
Ma-ọbu, B͕aputanum n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji?
24Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti:
Me-kwa-num ka m'ghọta ihe m'mehieworo n'amaghi-ama.
25Le ka okwu-ọnu nke ziri ezi si di irè!
Ma gini ka iba-nba nke si n'ọnu-unu puta nābara?
26Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba?
Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n'ihe di ka ifufe.
27Ọzọ kwa, n'aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà,
Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia.
28Ma ub͕u a kwenu ichem iru;
Ọ̀ bu kwa n'iru unu ka m'gēkwu okwu-ugha?
29Biko, chigharianu, ka ajọ omume ghara idi;
E, chigharianu ọzọ, ezi omumem di nime ya.
30Ọ̀ di ajọ omume di n'irem?
Òkpo-ọnum agaghi-amata ihe anāchọsi ike?

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOB 6: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye