Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 5

5
1Biko, kpọ òkù; ọ̀ di onye nāza gi?
Ònyè n'etiti ndi nsọ ka i gēche kwa iru?
2N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya,
Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.
3Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu:
M'we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede.
4Umu-ya nānọpu anya n'ebe nzọputa di,
Ewe zọpia ha n'ọnu-uzọ-ama,
Ọ dighi kwa onye nānaputa ha.
5Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya,
Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya,
Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.
6N'ihi na ajọ ihe adighi-esi n'ájá puta,
Ọ bughi kwa n'ala ka ọnọdu ọjọ si epuputa;
7Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ,
Dika icheke-ọku nile nēfeli elu.
8Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke,
Chineke ka m'gēbo kwa okwum:
9Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi;
Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:
10Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala,
Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi:
11Ido ndi di ala n'ebe di elu;
Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa.
12Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ,
Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere.
13Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha:
Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.
14N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri,
Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.
15O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha,
Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.
16Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya,
Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.
17Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba:
Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.
18N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u,
Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.
19Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi;
Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.
20N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu;
B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha.
21Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi;
I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia.
22I gāchì ihe-ike, chì kwa agu, ọchì;
I gaghi-atu kwa egwu anu-ọhia nke uwa.
23N'ihi na gi na nkume ọhia nile gādi n'ọb͕ub͕a-ndu;
Gi na anu ọhia gādi kwa n'udo.
24I gāma kwa na ulo-ikwū-gi di n'udo;
I gēlekọta kwa ebe-obibi-gi, i gaghi-emehie kwa.
25I gāma kwa na nkpuru-gi di ọtutu,
Umu nke putara n'aru-gi gādi kwa ka ihe-ọkukú nke ala.
26I gābia n'ílì n'ezib͕o agadi,
Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya.
27Le nka, ayi egwuputawo ala-ya, otú a ka ọ di;
Nuru ya, gi onwe-gi mata kwa ya n'onwe-gi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOB 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye