Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 12:8-18

I. IHE EMERE 12:8-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ndị a bụkwa dike nʼagha sitere nʼebo Gad gbasoo Devid nʼebe e wusiri ike ya dị nʼọzara. Ha bụkwa ndị ọka nʼiji ùbe na ọta alụ agha. Ha dịkwa gara gara dịka ele nʼelu ugwu, ihu ha dịkwa ka ihu ọdụm. Eza, bụ onyeisi ha. Ọbadaya bụ onye na-eso ya, tupu Eliab esoro. Onye nke anọ bụ Mishmana. Ndị ọzọ nʼusoro ha bụ, Jeremaya, na Atai bụ nke isii, na Eliel bụ nke asaa, na Johanan bụ nke asatọ, na Elzabad bụ nke itoolu, na Jeremaya onye nke iri, nakwa Makbanai onye nke iri nʼotu. Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha. Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike. Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.” Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya, “Anyị bụ ndị gị, Devid! Anyị so gị nʼazụ, gị nwa Jesi! Udo, udo ga-abụ nke gị, udo ga-abụkwa nke ndị na-enyere gị aka, nʼihi na Chineke gị na-enyere gị aka.” Ya mere, Devid nabatara ha mee ha ndịisi agha na-apụnara ndị mmadụ ihe.

I. IHE EMERE 12:8-18 Bible Nso (IGBOB)

Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n'ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n'usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n'elu ugwu; Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ; Mishmana, bú nke-ano, Jeremaia, bú nke-ise; Atai, bú nke-isi, Eliel, bú nke-asa; Johanan, bú nke-asatọ, Elzabad, bú nke-iteghete; Jeremaia, bú nke-iri, Makbanai, bú nke-iri-na-otù. Ndia, ndi sitere n'umu Gad, bu ndi-isi usu-ndi-agha: onye kachasi ntà ra ka ọgu ndikom ise, onye kachasi uku ra kwa ka nnù ndikom abua na ọgu iri. Ndia bu ndikom ahu ndi gabigara Jọdan n'ọnwa mbu, mb͕e osimiri ahu nēruchi usọ-ya nile; ha we me ka ndi ndagwurugwu nile b͕alaga, ma n'Ọwuwa-anyanwu ma n'Ọdida-anyanwu. Ufọdu nime umu Benjamin na Juda we biarue ebe ahu ewusiri ike biakute Devid. Devid we pua izute ha, o we za, si ha, Ọ buru na unu abiakutem n'uzọ udo iyerem aka, enwerem obi ọma n'aru unu ka mu na unu buru otù: ma ọ buru na unu abiawo iwere aghughọ nyem n'aka ndi nākpab͕um, mb͕e ihe-ike nādighi n'akam, ka Chineke nna-ayi-hà hu ya, bara unu nba. Mọ nke Chineke we yiri Amasai, bú onye-isi ndi-ọchi-agha ahu, dika uwe, o we si, Nke gi ka ayi bu, Devid, n'akuku gi ka ayi nọ kwa, nwa Jesi: udo, udo diri gi, udo di-kwa-ra onye nēyere gi aka; n'ihi na Chineke-gi enyeworo gi aka. Devid we nara ha, me ha ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe.