Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

1 Ihe E Mere 12:8-18

1 Ihe E Mere 12:8-18 BIU

Ndị a bụkwa dike nʼagha sitere nʼebo Gad gbasoo Devid nʼebe e wusiri ike ya dị nʼọzara. Ha bụkwa ndị ọka nʼiji ùbe na ọta alụ agha. Ha dịkwa gara gara dịka ele nʼelu ugwu, ihu ha dịkwa ka ihu ọdụm. Eza, bụ onyeisi ha. Ọbadaya bụ onye na-eso ya, tupu Eliab esoro. Onye nke anọ bụ Mishmana. Ndị ọzọ nʼusoro ha bụ, Jeremaya, na Atai bụ nke isii, na Eliel bụ nke asaa, na Johanan bụ nke asatọ, na Elzabad bụ nke itoolu, na Jeremaya onye nke iri, nakwa Makbanai onye nke iri nʼotu. Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha. Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike. Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.” Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya, “Anyị bụ ndị gị, Devid! Anyị so gị nʼazụ, gị nwa Jesi! Udo, udo ga-abụ nke gị, udo ga-abụkwa nke ndị na-enyere gị aka, nʼihi na Chineke gị na-enyere gị aka.” Ya mere, Devid nabatara ha mee ha ndịisi agha na-apụnara ndị mmadụ ihe.