I. IHE EMERE 12
12
1Ma ndia bu ndi nābiakute Devid rue Ziklag, mb͕e anọ̀ nēmechibido ya n'ihi Sọl nwa Kish: ndi ahu di kwa n'etiti ndi-dike-ya, ndi nēyere ya aka n'agha ahu. 2Ha nāchi uta, nēme aka-nri nēme kwa aka-ekpe n'itu nkume na n'iwere uta b͕a àkú; ha sitere n'umu-nne Sọl site na Benjamin. 3Onye-isi bu Ahieza, na Joash, bú umu Shemaa onye Gibea; na Jeziel, na Pelet, bú umu Azmavet; na Beraka, na Jihu onye Anatot; 4na Ishmaia onye Gibeon, bú dike n'etiti orú ndikom na iri ahu, na onye-isi orú na iri ahu; na Jeremaia, na Jahaziel, na Johanan, na Jozabad onye Gedira; 5Eluzai, na Jerimot, na Bealia, na Shemaraia, na Shefataia onye-Harufait; 6Elkena, na Ishia, na Azarel, na Joeza, na Jashọbeam, bú ndi Kora; 7na Joela, na Zebadaia, bú umu Jeroham nke Gedoa. 8Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n'ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n'usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n'elu ugwu; 9Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ; 10Mishmana, bú nke-ano, Jeremaia, bú nke-ise; 11Atai, bú nke-isi, Eliel, bú nke-asa; 12Johanan, bú nke-asatọ, Elzabad, bú nke-iteghete; 13Jeremaia, bú nke-iri, Makbanai, bú nke-iri-na-otù. 14Ndia, ndi sitere n'umu Gad, bu ndi-isi usu-ndi-agha: onye kachasi ntà ra ka ọgu ndikom ise, onye kachasi uku ra kwa ka nnù ndikom abua na ọgu iri. 15Ndia bu ndikom ahu ndi gabigara Jọdan n'ọnwa mbu, mb͕e osimiri ahu nēruchi usọ-ya nile; ha we me ka ndi ndagwurugwu nile b͕alaga, ma n'Ọwuwa-anyanwu ma n'Ọdida-anyanwu. 16Ufọdu nime umu Benjamin na Juda we biarue ebe ahu ewusiri ike biakute Devid. 17Devid we pua izute ha, o we za, si ha, Ọ buru na unu abiakutem n'uzọ udo iyerem aka, enwerem obi ọma n'aru unu ka mu na unu buru otù: ma ọ buru na unu abiawo iwere aghughọ nyem n'aka ndi nākpab͕um, mb͕e ihe-ike nādighi n'akam, ka Chineke nna-ayi-hà hu ya, bara unu nba. 18Mọ nke Chineke we yiri Amasai, bú onye-isi ndi-ọchi-agha ahu, dika uwe, o we si, Nke gi ka ayi bu, Devid, n'akuku gi ka ayi nọ kwa, nwa Jesi: udo, udo diri gi, udo di-kwa-ra onye nēyere gi aka; n'ihi na Chineke-gi enyeworo gi aka. Devid we nara ha, me ha ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe. 19Ufọdu nime Manase dinyekwara Devid, mb͕e o soro ndi Filistia bia imegide Sọl n'agha, ma ha eyeghi ha aka: n'ihi na ndi-isi ndi Filistia were idu-ọdu zilaga ya, si, Ọ gēwere isi-ayi danyere onye-nwe-ya, bú Sọl. 20Mb͕e ọ nāla na Ziklag, ndia sitere na Manase danyere ya, bú Adna, na Jozabad, na Jediael, na Maikael, na Jozabad, na Elaihu, na Ziletai, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri ndi diri Manase. 21Ndi ahu ye-kwa-ra Devid aka imegide usu ndi nāpunara madu ihe: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha nile bu, ha we buru ndi-isi n'usu-ndi-agha. 22N'ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke.
23Ndia bu kwa ọnu-ọgugu ndi-isi nke ndi ejikere iso usu-ndi-agha; ha biakutere Devid nime Hebron ichighari ala-eze Sọl nye ya, dika okwu-ọnu Jehova si di. 24Umu Juda ndi nēbu ọta na ube di nnù iri-na-asa, ndi ejikere iso usu-ndi-agha. 25Site n'umu Simeon, ndi-dike bu dìnkpà iso usu-ndi-agha, nnù iri-na-asa na ọgu iri-na-ise. 26Site n'umu Livai, nnù iri-na-otù na ọgu iri. 27Jehoiada bu onye-ndú ndi Eron, nnù ndikom iteghete na ọgu ise so-kwa-ra ya; 28na Zedok, bú nwa-okorọbia nke bu dike bu dìnkpà, na nke ulo nna-ya orú ndi-isi na abua. 29Site kwa n'umu Benjamin, bú umu-nne Sọl, nnù asa na ọgu iri: n'ihi na rue mb͕e ahu ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha nēdebe ihe-ndebe ulo Sọl. 30Site kwa n'umu Efraim, orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-abua, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha n'ulo nke ndi bu nna-ha. 31Site kwa na nkera ebo Manase, orú nnù uzọ abua na nnù ise, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ibia ime Devid eze. 32Site kwa n'umu Isaka, bú ndi mara nghọta bayere mb͕e ahu nile, imara ihe Israel gēme; ndi-isi-ha bu ọgu iri; umu-nne-ha nile nēme kwa dika okwu-ọnu-ha si di. 33Site na Zebulun, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēdo agha n'usoro, ndi chiri ihe-agha nile, orú nnù uzọ isi na nnù ise; ndi nēdo onwe-ha n'usoro, nēnweghi obi abua. 34Site kwa na Naftali, nnù ndi-isi abua na ọgu iri, orú nnù ndikom uzọ anọ na nnù iri-na-abua na ọgu iri so-kwa-ra ha nāchi uta na ube. 35Site kwa na ndi Dan, bú ndi nēdo agha n'usoro, orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-otù na ọgu iri. 36Site kwa n'Asha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ido agha n'usoro, orú nnù uzọ ise. 37Site kwa n'ofè Jọdan, site n'umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, bú ndi nāchi ihe nile nke usu-ndi-agha iji bu agha, orú nnù uzọ iri-na-ise. 38Ndia nile, bú ndikom agha, ndi nēdo agha n'usoro, were obi zuru okè biarue Hebron, ime Devid eze Israel nile: ọzọ kwa, ndi Israel nile nke fọduru nwere otù obi ime Devid eze. 39Ha na Devid we nọ n'ebe ahu ubọchi atọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu: n'ihi na umu-nne-ha doziri ha ihe. 40Ọzọ kwa, ndi bi ha nso, rue Isaka na Zebulun na Naftali, nēweta achicha n'elu inyinya-ibu na n'elu camel, na n'elu inyinya mule, na n'elu ehi, ihe-oriri nke utu ọka, na mbadamba fig, na uyọkọ nkpuru-vine amiri ami, na manya-vine, na manu, na ìgwè ehi, na ìgwè ewu na aturu n'uba: n'ihi na ọṅù di n'Israel.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
I. IHE EMERE 12: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.