Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ NKE ABÙ 8

8
1Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i dirim ka nwa-nnem nwoke,
Nke miworo ara abua nke nnem!
Mb͕e m'huru gi n'èzí, m'gēsutu gi ọnu;
Ma ọ dighi onye gēledam anya.
2M'gēduru gi, me ka i ba n'ulo nnem,
I gēzím ihe;
M'gēme ka i ṅua manya-vine ufọdu etiyere ihe-ísì-utọ,
Ka i ṅu kwa manya pomegranate nkem ufọdu.
3Aka-ekpe-ya gādi n'okpuru isim,
Aka-nri-ya gāb͕akum.
4Unu umu-ndinyom Jerusalem, ab͕am unu iyi,
Gini mere unu ji akpọte ihu-n'anya? ma-ọbu gini mere unu ji eme ka ọ teta?
Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.
5Ònye bu nwayi a nke nēsi n'ọzara arigota,
Dabere n'aru onye ihe-ya nātọ ya utọ?
N'okpuru osisi apple ka m'kpọtere gi:
N'ebe ahu ka ime gi nēme nne-gi,
N'ebe ahu ka ime nēme ya, o we muputa gi.
6Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n'obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n'ogwe-aka-gi:
N'ihi na ihu-n'anya di ike dika ọnwu;
Ekworo siri ike dika ala-mọ:
Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku,
Ire-ọku nke Ja onwe-ya.
7Ọtutu miri apughi imenyu ihu-n'anya,
Osimiri nile agaghi-erikpu kwa ya:
Ọ buru na onye ọ bula gēnye àkù nile nke ulo-ya n'ihi ihu-n'anya,
Agēleda ya anya nke-uku.
8Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà,
Ma ọ dighi ara ọ kpuru:
Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayi
N'ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya?
9Ọ buru na ọ bu mb͕idi,
Ayi gēwukwasi ya ulo-elu nke ọla-ọcha:
Ma ọ buru na ọ bu ọnu-uzọ,
Ayi gēji ibo cedar mechibido ya.
10Mu onwem bu mb͕idi, aram abua di kwa ka ulo-elu-ya:
Mb͕e ahu adim n'anya-ya dika onye nāchọta udo.
11Solomon nwere ubi-vine nime Beal-hamon;
Ọ nyere ubi-vine ahu n'aka ndi-nche;
Onye ọ bula n'ọnọdu nkpuru-ya gēweta nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri.
12Ubi-vine nkem, nke m'nwere, di n'irum:
Nnù abua na ọgu iri ahu gādiri gi, Solomon,
Ọgu iri gādi-kwa-ra ndi nēche nkpuru-ya.
13Gi onye bi n'ubi ab͕ara ogige,
Ndi ejikọtara gi na ha nāṅa nti olu-gi:
Mem ka m'nuru ya.
14B͕alaga, gi onye ihe-gi nātọm utọ,
Yi kwa mb͕ada ma-ọbu nwa-ele
N'elu ugwu nile nke uda di iche iche.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ NKE ABÙ 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye