Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 1

1
1Ọhù Aisaia nwa Emoz, nke ọ huru bayere Juda na Jerusalem n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda.
2Nurunu, elu-igwe, gi uwa, ṅa kwa nti, n'ihi na Jehova ekwuwo okwu: umu ka M'meworo ka ha toputa, emewokwam ka ha di elu, ma umu ahu ejehiewo megidem. 3Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzùzù-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amaghi, ndim atukwasighi uche. 4Ahuhu gādiri mba nmehie, ndi ajọ omume nānyib͕u, nkpuru nke bu ndi nēme ihe ọjọ, umu nke nēbibi onwe-ha: ha arapuwo Jehova, ha elelìwo Onye Nsọ nke Israel, ha aghọwo ndi ala ọzọ, laghachi azu. 5N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike. 6Site n'ọbu-ukwu we rue isi ọ dighi izu-okè di nime ya; kama ob͕ub͕u-mma, na itiru-aru, na ọnyá etiputara ọhu: apikọtaghi ha, ekechighi kwa ha, ejighi kwa manu me ka ha di nrò. 7Ala-unu bu ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-unu, esurewo ha n'ọku; ala-ubi-unu, n'iru unu ka ndi ala ọzọ nēri ya, ọ bu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, dika nkwatu ndi ala ọzọ. 8Ma ada Zaion fọduru dika ulo-ntu n'ubi-vine, dika ulo-ọnọdu-abali n'ubi cucumbei, dika obodo nke ndi-iro-ya nēche nche. 9Ọ buru na Jehova nke usu nile nke ndi-agha emeghi madu ole-na-ole nke fọduru ka ha fọduru ayi, ayi gādiwori ka Sọdọm, ayi gēyiwori Gọmọra.
10Nurunu okwu Jehova, unu ndi-ikpe Sọdọm; ṅanu nti n'iwu Chineke-ayi, unu ndi Gọmọra. 11Jehova nāsi, N'ìhi gini ka unu nāchurum ọtutu àjà-unu? afọ ejuwom n'àjà-nsure-ọku nile eji ebulu chu, na abuba umu-ehi emere ka ha ma abuba; ọzọ, ọbara oke-ehi na nke umu-aturu na nke nkpi atọghm utọ. 12Mb͕e unu nābia ka ahu unu n'irum, ònye chọworo nka n'aka-unu, ka unu zọtọ ogigem nile? 13Unu ebubata-kwa-la onyinye-inata-iru-ọma ọzọ nke bu ihe-efu; ihe-nsure-ọku nke nēsì ísi utọ, ihe-árú ka ọ burum; ọnwa ọhu na ubọchi-izu-ike, ikpọ nkpọkọta -- apughm inagide ajọ omume na ubọchi nb͕ochi. 14Ọnwa ọhu nile unu na mb͕e nile unu akara àkà, nkpuru-obim akpọwo ha asì: ha aghọwo ibu di arọ̀ n'arum, ike ibūru ha agwuwom. 15Ọzọ, mb͕e unu nāb͕asa ọbu-aka-unu abua, M'gēzonari unu anyam abua: ọbuná mb͕e unu nēkpe ọtutu ekpere, M'gaghi-adi nānu: aka-unu juputara n'ọbara. 16Sanu aru, menu onwe-unu ka unu di ọcha; wezuganu ihe ọjọ nke omume-unu nile n'iru anyam abua; rapunu ime ihe ọjọ: 17mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.
18Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi. 19Ọ buru na unu ekwe, we nu, ezi ihe nke ala-unu ka unu gēri: 20ma ọ buru na unu aju, we nupu isi, mma-agha gērichapu unu: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.
21Ò si-kwa-ra aṅa ghọ nwanyi nākwa iko, bú obodo ahu kwesiri ntukwasi-obi? obodo ahu nke juputara n'ikpé ziri ezi! ezi omume nānọri ọnọdu-abali nime ya, ma ub͕u a ndi-ob͕u-madu. 22Ọla-ọcha-gi aghọwo afuru-uzu; ihe-ọṅuṅu ọma gi, agwawo ya miri nke-uku. 23Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.
24N'ihi nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye di ike nke Israel, puta,) A, M'ga-akasi Onwem obi site na ndi nēmegidem, M'gābọ-kwa-ra Onwem ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom: 25M'gēme kwa ka akam biaghachi n'aru gi, M'gānuchapu kwa afuru-uzu-gi, dika eji akanwu me, M'gēwezuga kwa ihe nile gwara agwa nime gi: 26M'gēme kwa ka ndi-ikpe-gi laghachi dika na mbu, M'gēme kwa ka ndi nādu gi ọdu laghachi dika na nmalite: emesia agākpọ gi Obodo ezi omume, obodo nke kwesiri ntukwasi-obi. 27Agēji ikpé b͕aputa Zaion, agēji kwa ezi omume b͕aputa ndi-ya nālata. 28Ma ntipia nke ndi nēmebi iwu na ndi-nmehie gādi n'otù, agēme kwa ka ndi nārapu Jehova gwusia. 29N'ihi na ha gēme ihere osisi terebinth nile nke unu chọsiworo ike, unu gēnwe kwa iru-ihere site n'ubi nile ab͕ara ogige nke unu rọputaworo. 30N'ihi na unu gādi ka osisi terebinth nke akwukwọ-ya nākpọnwu akpọnwu, na dika ubi ab͕ara ogige nke nēnweghi miri. 31Ọgaranya gāghọ kwa eriri-nzuzu, ọlu-ya gāghọ kwa icheke-ọku; ha abua gēre kwa ọku n'otù, ọ dighi kwa onye nēmenyu ha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

AISAIA 1: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye