Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ NKE ABÙ 5

5
1Abatawom n'ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem:
Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam;
Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum;
Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim.
Rienu ihe, ndi-eyim;
Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ.
2Mu onwem nāraru ura, ma obim nēteta:
Ọ bu olu nke onye ihe-ya nātọm utọ nāku aka n'uzọ, si,
Megherem uzọ, nwa-nnem nwayi, eyìm, ndurum, onye nkem nke zuru okè:
N'ihi na isim juputara n'igirigi,
Agiri-isim juputara n'ọbubu-miri nke abali.
3Eyipuwom uwem; #m'gēsi aṅa yiri ya?
Asawom ukwum abua; #m'gēsi aṅa me ka ha rue inyi?
4Onye ihe-ya nātọm utọ setipuru aka-ya tiye n'oghere uzọ,
Afọm we me nkpatu n'ihi ya.
5Mu onwem biliri imeghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ;
Akam abua nābusi kwa na myrrh,
Nkpisi-akam nile nābusi kwa na myrrh nērù erù,
N'elu nkpisi nile nke ugodi.
6Mu onwem meghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ;
Ma onye ihe-ya nātọm utọ wezugarari onwe-ya, gabiga.
Nkpuru-obim apuwori mb͕e o kwuru okwu:
Achọrọm ya, ma Achọtaghm ya;
Akpọrọm ya òkù, ma ọ zaghm.
7Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum,
Ha tirim ihe, b͕uem mma;
Ndi-nche mb͕idi nile nke obodo chipuru ákwà-nb͕ochim n'arum.
8Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ,
Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n'anya nāria ka m'bu.
9Gini ka onye ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,
Gi onye mara nma n'etiti ndinyom?
Gini ka ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,
Na i b͕awo ayi iyi otú a?
10Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie,
Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise.
11Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha,
Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma.
12Anya-ya abua di ka nduru n'akuku miri-iyi;
Nāsa onwe-ha nime miri-ara-ehi, nānọdu n'akuku miri-iyi di iche iche juputara na miri.
13Ǹtì-ya abua di ka nkpuru uda, dika ulo-elu nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ:
Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua di ka urodi, nābusi myrrh nērù erù.
14Aka-ya abua di ka nb͕a-aka ọla-edo, nke ahiọgideworo beryl nime ha:
Afọ-ya di ka ọdu nwupuru enwupu, nke ejiworo sapphire kpuchie ya.
15Ogwe-ukwu-ya abua di ka ogidi marble, nke atọworo ntọ-ala-ha n'elu ukwu ọla-edo anuchara anucha:
Iru-ya di ka Lebanon, mara nma nke-uku dika cedar.
16Okpu-ọnu-ya tọkarisiri utọ: e, aru-ya nile bu ihe anāchọsi ike.
Nka bu onye ihe-ya nātọm utọ, nka bu kwa eyìm,
Unu umu-ndinyom Jerusalem.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ NKE ABÙ 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye