ABÙ ỌMA 82
82
Abù Ọma Esaf.
1Chineke nēguzo Onwe-ya nime nzukọ Chineke;
N'etiti chi nile ka Ọ nēkpe ikpe.
2Rùe ole mb͕e ka unu gēkpe ikpe ajọ omume?
Rù kwa ole mb͕e ka unu gāhu ndi nēmebi iwu iru-ọma?
3Kpenu onye nēnweghi ike na nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi:
Guanu onye ewedara n'ala na onye nọ na nkpà n'onye ezi omume.
4Menu ka onye nēnweghi ike na ob͕eye b͕apu:
Naputanu ha n'aka ndi nēmebi iwu.
5Ha amaghi, ha aghọtaghi kwa;
N'ọchichiri ka ha nējeghari:
Ewezugawo ntọ-ala nile nke uwa n'ọnọdu-ha.
6Mu onwem siri, Chi ka unu bu,
Ọ bu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu ka unu bu.
7Otú ọ di, dika madu ka unu gānwu,
Ọ bu kwa dika otù nime ndi-isi ka unu gādà.
8Bilie, Chineke, kpe uwa ikpe:
N'ihi na Gi onwe-gi gēketa ihe, bú mba nile.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
ABÙ ỌMA 82: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.