Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 81

81
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Gittith. Abù Ọma nke Esaf.
1Tikuenu Chineke, bú ike-ayi, nkpu ọṅụ:
Tikusienu Chineke nke Jekob nkpu ọṅụ ike.
2Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti,
Na ubọ-akwara di utọ, ya na une.
3Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu,
N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi.
4N'ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu,
Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere.
5Ihe-àmà nime Josef ka O doro ya,
Mb͕e Ọ putara imegide ala Ijipt:
Ọ bu okwu-ọnu nke otù onye m'nāmaghi ka m'nānu.
6Ewezugaram ubu-ya n'ibu:
Ọbu-aka-ya abua nēsi n'abọ gabiga.
7Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi;
Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe;
Anamanwa gi n'akuku miri Meriba. Selah
8Nuru, ndim, M'gāb͕a àmà megide gi:
Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti!
9Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi;
I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ.
10Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi,
Nke nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa:
Meghe ọnu-gi ka ọ sa mbara, M'gēmeju kwa ya.
11Ma ndim egeghi nti olum;
Israel ekweghikwam.
12M'we zilaga ha n'isi-ike nke obi-ha,
Ka ha we nējeghari na ndum-ọdu nile ha.
13Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndim ganēgem nti,
Ma asi na Israel gēje ije n'uzọm nile!
14Nwa mb͕e ka M'gēji me ka ndi-iro-ha ruru ala,
Ọ bu kwa imegide ndi nākpab͕u ha ka M'gēchighari akam.
15Ndi nākpọ Jehova asi gērube isi aghughọ n'okpuru Ya:
Ma mb͕e-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi.
16Ọ gēme kwa ka ha rie abuba ọka wheat:
Ọ bu kwa manu-aṅu nke sitere n'oké nkume ka M'gēji nyeju gi afọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 81: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye