Ùb͕ò ole ka ha nānupu isi n'okpuru Ya n'ọzara?
Ùb͕ò ole ka ha nēme ka o wuta Ya n'ala tọb͕ọrọ n'efu?
Ha we chigharia, we nwa Chineke,
Ọ bu kwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe.
Ha echetaghi aka-Ya,
Ubọchi mb͕e Ọ b͕aputara ha n'aka onye-nkpab͕u.
Otú O tiyere ihe-iriba-ama-Ya nile n'Ijipt,
Tiye kwa ihe-ebube-Ya nile n'ọhia Zoan;
O we b͕anwe osimiri Nail nile ha ka ha ghọ ọbara,
Ha adighi-aṅu kwa miri-ha nērù erù.
Ọ nēzite odudu n'etiti ha, nke nātab͕u ha;
Ọ nēzite kwa awo, nke nēbibi ha.
Ọ nye-kwa-ra ọbubu ihe-omume-ha,
Nye kwa igurube ihe ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inweta.
O nēji ákú-miri-ígwé b͕u osisi vine nile ha,
Ji kwa frost b͕u osisi sycomore nile ha.
O mechibido-kwa-ra anumanu-ha nye ákú-miri-ígwé,
Mechibido kwa anu-ulo nile ha nye àmùmà di ọku.
Ọ nēzite ọnuma nke iwe-Ya n'etiti ha,
Nrubiga-ókè-iwe, na iwe, na nkpab͕u,
Bú ozìzì nke ndi-mọ-ozi nke ihe ọjọ.
Ọ nēme ka uzọ di lari bayere iwe-Ya;
O b͕ochighi nkpuru-obi-ha n'inwu ọnwu,
Kama O mechibidoro ndu-ha nye ajọ ọria nēfe efe;
O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n'Ijipt,
Bú nkpuru mbu nke ume-ha n'ulo-ikwū nile nke Ham:
O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu,
Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu.
O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu:
Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.
O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya,
Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara.
Ọ chupu-kwa-ra mba nile n'iru ha,
We me ka ala ha barue ndi ya aka n'ala nketa e ji údò tua,
O we me ka ebo nile nke Israel biri n'ulo-ikwū-ha.
Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya,
Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile;
Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha:
Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ.
Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe,
Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.
Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè,
Jusie Israel ike:
O we rapu ebe-obibi nke Shailo,
Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n'etiti madu;
O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha,
Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u.
O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha;
Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.
Ọku ripiara umu-okorọbia-ha;
Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.
Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha;
Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.
Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura,
Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.
O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu:
Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha.
Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef,
Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara;
Kama Ọ rọputara ebo Juda,
Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya.
O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu,
Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.
Ọ rọputa-kwa-ara Devid, bú orù-Ya,
O we si n'ogige ìgwè ewu na aturu kuru ya:
O mere ka o si n'iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia,
Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu.
O we nāzù ha dika izu-okè nke obi-ya si di;
Were kwa ihe-nghọta nile nke ọbu-aka-ya abua nēdu ha.