Ndim, ǹanu nti n'iwum:
Tọnu nti n'ala inu okwu nile nke ọnum.
M'gāsaghe ọnum n'itu ilu:
M'gēkwuwa okwu-omimi di iche iche n'uba, bú nke sitere na mb͕e ochie:
Nke ayi nuworo mara kwa,
Nke nna-ayi-hà kọwo-kwa-ra ayi.
Ayi agaghi-ezonari ha na nti umu-ha,
Nākọrọ ọb͕ọ nke gādi n'iru akukọ otuto nile nke Jehova,
Na ike-Ya, na oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo.
O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob,
O do-kwa-ra iwu n'Israel,
Nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu,
Ime ka umu-ha mara ha:
Ka ọb͕ọ nke gādi n'iru we mara, bú umu agāmu;
Ha gēbili, we kọro umu-ha akukọ ahu:
Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke,
Ghara ichezọ omume nile nke Chineke,
Ma debe ihe nile O nyere n'iwu:
Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha,
Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi;
Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha,
Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.
Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta,
Ma ha chighariri n'ubọchi agha.
Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke,
Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya;
Ha we chezọ omume-Ya nile,
Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu.
N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu,
N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan.
O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga;
O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.
O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie,
Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.
Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara,
We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.
O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta,
O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.
Ma ha nọ nēmehie kwa ọzọ imegide Ya,
Inupu isi n'okpuru Onye kachasi ihe nile elu n'ala kpọro nku.
Ha we nwa Chineke n'obi-ha
N'iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha.
Ha we kwue okwu megide Chineke;
Ha siri, Chineke, Ọ̀ puru ido table n'usoro n'ọzara?
Le, O tiri oké nkume ihe, miri we nērù erù,
Isi-iyi di iche iche nērubiga kwa ókè;
Ọ̀ di kwa achicha Ọ puru inye?
Ọ̀ gēdoziri ndi-Ya anu?
N'ihi nke Jehova nuru, O we webiga iwe ókè:
Ewe kponwue ọku megide Jekob,
Ọzọ kwa, iwe kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide Israel;
N'ihi na ha ekweghi na Chineke,
Ha atukwasighi kwa obi-ha na nzọputa-Ya.
O we nye mbara-ígwé nile n'elu iwu,
Meghe kwa ọnu-uzọ nile nke elu-igwe;
O we me ka manna zokwasi ha dika miri, ka ha rie,
Ọ bu kwa ọka nke elu-igwe ka O nyere ha.
Nri nke ndi di ike ka madu riri:
O zitere ha ihe ha gēriju afọ.
O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe:
O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.
O we me ka anu zokwasi ha dika ájá,
Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù:
O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha,
Buruburu ebe-obibi-ha nile.
Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku;
Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.
Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di,
Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu,
Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha,
We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba,
Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.
N'ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ,
Ha ekweghi kwa n'oké ọlu-Ya nile.
O we me ka ubọchi nile ha gwusia n'otù nku-ume,
O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n'obi-ọlulọ-miri.
Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya:
Laghachi kwa, chọsie Chineke ike.
Ha we cheta na Chineke bu oké nkume-ha,
Cheta kwa na Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu Onye-nb͕aputa-ha.
Ha we ji ọnu-ha nārà Ya,
Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.
Obi-ha eguzosighi kwa ike n'ebe Ọ nọ,
Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n'ọb͕ub͕a-ndu-Ya.
Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha:
E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu,
Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.
O we cheta na anu-aru ka ha bu;
Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi.