Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 72

72
Abù Ọma nke Solomon.
1Chineke, nye eze ikpé-Gi nile,
Nye kwa nwa eze ezi omume-Gi.
2O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe,
O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n'ala.
3Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo,
Ugwu ntà kwa, n'ezi omume.
4Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe,
Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa,
Zọpia kwa onye-nmeb͕u.
5Ha ganātu egwu Gi ogologo mb͕e anyanwu gādigide,
Na n'iru ọnwa, rue ọb͕ọ nile.
6Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n'ọzara asuru asu:
Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala.
7Onye ezi omume gāma akwukwọ n'ubọchi nile ya dika osisi ndu;
Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi.
8Ya nwe kwa ike n'aru madu site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ,
Site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.
9Ndi bi n'ala kpọrọ nku gēruru ala n'iru ya;
Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá.
10Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma:
Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.
11E, eze nile gākpọ isi ala nye ya:
Mba nile gēfè ya òfùfè.
12N'ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya;
Ọ gānaputa kwa onye ewedara n'ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka.
13Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere,
Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa.
14Ọ gēsi n'aka nzọb͕u na n'aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha;
Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n'anya-ya.
15Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n'ọla-edo Sheba:
Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile;
Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya.
16Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile;
Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon:
Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala.
17Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi;
N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù:
Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya:
Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.
18Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke, bu, bú Chineke nke Israel,
Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:
19Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi;
Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya.
Amen, na Amen.
20Ekpere nke Devid nwa Jesi agwuwo.
AKWUKWỌ NKE-ATỌ

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 72: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye