Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike: Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike, N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi. Otú a ka m'lekwasiworo Gi anya n'ebe nsọ gi, Ihu ike-Gi na nsọpuru-Gi. N'ihi na ebere-Gi di nma kari ndu; Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāja Gi. Otú a ka m'gāgọzi Gi mb͕e m na-ādi ndu: N'aha-Gi ka m'gāchili akam elu. Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ; Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi; Ọ buru na echetam I n'elu utem, Nime nche-abali nile ka m'nātughari uchem na Gi. N'ihi na I buworom iye-aka, Ọ bu kwa n'okpuru ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'nēti nkpu ọṅù. Nkpuru-obim nārapara Gi n'aru n'iso Gi n'azu: Mu ka aka-nri-gi jideworo. Ma ndi ahu, ọ bu ime ka ọ la n'iyì ka ha nāchọ nkpuru-obim, Ha gābà n'ebe nile di ala nke uwa.
Gụọ ABÙ ỌMA 63
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 63
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 63:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị