Ge nti n'ekperem, Chineke; Ezonari-kwa-la Onwe-gi n'aririọ-amaram. Ṅam nti, zam: Anamalù ulù na ntughari-obim, nāsu kwa oké ude; N'ihi olu onye-iro, N'ihi nkpab͕u nke onye nēmebi iwu; N'ihi na ha nēme ka ajọ ihe me nkpatu megidem, Ọ bu kwa n'iwe ka ha nākpọm asì. O nēb͕usi nkpuru-obim nb͕u ike nimem: Oké ujọ nile nke ọnwu adakwasiwo-kwam. Egwu na ima-jijiji nābiarum aru, Oké ọma-jijiji ekpuchiwokwam. M'we si, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem nkù dika nduru! M'gēfela, we nọdu du. Le, m'gēferu ebe di anya, Nọ ọnọdu-abali n'ọzara. Selah M'gēwere ọsọsọ si n'ifufe siri ike na n'oké ifufe Biarue ebe-nb͕apu dirim. Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha: N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo. N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile: Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya. Ihe-ila-n'iyì di iche iche di n'etiti ya: Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n'amá-ya nile. N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta; M'gānagide kwa ya: Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem; M'gēzonari kwa ya onwem: Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra, Eyìm, na onye m'mara nke-ọma. Ayi nāb͕akọri ìzù utọ, N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu.
Gụọ ABÙ ỌMA 55
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 55
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 55:1-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị