Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 55

55
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'ubọ-akwara. Maschil Devid.
1Ge nti n'ekperem, Chineke;
Ezonari-kwa-la Onwe-gi n'aririọ-amaram.
2Ṅam nti, zam:
Anamalù ulù na ntughari-obim, nāsu kwa oké ude;
3N'ihi olu onye-iro,
N'ihi nkpab͕u nke onye nēmebi iwu;
N'ihi na ha nēme ka ajọ ihe me nkpatu megidem,
Ọ bu kwa n'iwe ka ha nākpọm asì.
4O nēb͕usi nkpuru-obim nb͕u ike nimem:
Oké ujọ nile nke ọnwu adakwasiwo-kwam.
5Egwu na ima-jijiji nābiarum aru,
Oké ọma-jijiji ekpuchiwokwam.
6M'we si, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem nkù dika nduru!
M'gēfela, we nọdu du.
7Le, m'gēferu ebe di anya,
Nọ ọnọdu-abali n'ọzara. Selah
8M'gēwere ọsọsọ si n'ifufe siri ike na n'oké ifufe
Biarue ebe-nb͕apu dirim.
9Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha:
N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.
10N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile:
Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya.
11Ihe-ila-n'iyì di iche iche di n'etiti ya:
Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n'amá-ya nile.
12N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta;
M'gānagide kwa ya:
Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem;
M'gēzonari kwa ya onwem:
13Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra,
Eyìm, na onye m'mara nke-ọma.
14Ayi nāb͕akọri ìzù utọ,
N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu.
15Ka ọnwu biakwasi ha na mberede,
Ka ha ridarue ala-mọ na ndu:
N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha.
16Ma mu onwem, Chineke ka m'gākpọku;
Jehova gāzọputakwam.
17Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m'gātughari uche, su kwa oké ude:
Ọ gānu kwa olum.
18Ọ b͕aputawo nkpuru-obim me ka ọ ba n'udo, ka ha ghara ibiarum nso:
N'ihi na ha bara uba, bú ndi mu na ha nālu ọ̀gù.
19Chineke gānu olum, weda kwa ha n'ala,
Bú Onye nānọdu ka eze site na mb͕e ochie. Selah
Ha bu ndi nēnweghi nb͕anwe,
Ha adighi-atu kwa egwu Chineke.
20O setiwo aka-ya abua imegide ndi ya na ha nọ n'udo:
O mewo ọb͕ub͕a-ndu-ya ka ọ ghara idi nsọ.
21Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru,
Ma nání agha ka obi-ya bu:
Okwu-ya nile di nrò kari manu,
Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa.
22Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi:
Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi
23Ma Gi onwe-gi, Chineke, gēme ka ha rida n'olùlù nbibi:
Ndi bu ndi-ọbara na ndi-aghughọ agaghi-adiru nkera ubọchi-ha;
Ma mu onwem gātukwasi obi na Gi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 55: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara