Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 55:1-14

ABÙ ỌMA 55:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O Chineke, nụrụ ekpere m, agbakwala arịrịọ m nkịtị; ṅaa m ntị, zaakwa m. Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude nʼihi ihe onye iro m na-ekwu, nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ, na-akpagbu m nʼiwe ha. Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m; oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m. Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m; oke egwu ekpuchiela m. Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru! Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike. Agaara m efelaga ebe dị anya, ga nọrọ nʼọzara; Sela Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m, ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.” O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu, nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo. Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya; iro na mmegbu dị nʼime ya. A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo; ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo. A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, apụrụ m ịnagide ya; a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ. Maọbụ gị, nwoke dịka m, onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma, onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, nʼụlọ Chineke, ka anyị na-ejegharị nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.