Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 42

42
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Maschil nke umu Kora.
1Dika agu iyi miri si agu nne-ele,
Otú a ka agu Gi nāgu nkpuru-obim, Chineke.
2Akpiri Chineke, bú Chineke di ndu, akpọwo nkpuru-obim nku:
Òle mb͕e m'gābia, ewe hum n'iru Chineke?
3Anya-mirim aghọworom nri ehihie na abali,
Mb͕e ha nāsim ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ?
4Ihe ndia ka m'gēcheta, wusi kwa nkpu tu-obim nimem dika miri,
Otú m'nāgabiga n'etiti ìgwè madu, nējere ha nwayọ dika onye-ndú-ha rue ulo Chineke,
N'olu iti-nkpu-ọṅù na nke ekele, bú ìgwè madu nēme ememe.
5Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim?
Gini mere i ji su ude nke-uku nimem?
Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ
N'ihi nzọputa nile nke iru-Ya.
6Chinekem, nimem ka nkpuru-obim nēruda n'ala:
N'ihi ya anamecheta Gi site n'ala Jọdan,
Site kwa na Heamon, site n'ugwu Miza.
7Ob͕u-miri nākpọ ob͕u-miri òkù n'olu nrùda-miri nile nke Gi:
Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile agabigawo n'isim.
8N'ehihie Jehova gēnye ebere-Ya iwu,
N'abali kwa ka abù-Ya gādi n'onum,
Bú ekpere m'nēkpere Chineke nke ndum.
9Ka m'si Chineke, bú nkumem di elu, N'ìhi gini ka I chezọworom?
N'ìhi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro?
10Dika asi na eji ihe gwepia ọkpukpum nile, ndi nākpab͕um nātam uta;
Mb͕e ha nāsin ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ?
11Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim?
Gini mere i ji su ude nke-uku nimem?
Chere Chineke: n'ihi na m'agēkele kwa Ya ọzọ,
Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 42: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye