1
ABÙ ỌMA 42:11
Bible Nso
Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'agēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa ABÙ ỌMA 42:11
2
ABÙ ỌMA 42:1-2
Dika agu iyi miri si agu nne-ele, Otú a ka agu Gi nāgu nkpuru-obim, Chineke. Akpiri Chineke, bú Chineke di ndu, akpọwo nkpuru-obim nku: Òle mb͕e m'gābia, ewe hum n'iru Chineke?
Nyochaa ABÙ ỌMA 42:1-2
3
ABÙ ỌMA 42:5
Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ N'ihi nzọputa nile nke iru-Ya.
Nyochaa ABÙ ỌMA 42:5
4
ABÙ ỌMA 42:3
Anya-mirim aghọworom nri ehihie na abali, Mb͕e ha nāsim ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ?
Nyochaa ABÙ ỌMA 42:3
5
ABÙ ỌMA 42:6
Chinekem, nimem ka nkpuru-obim nēruda n'ala: N'ihi ya anamecheta Gi site n'ala Jọdan, Site kwa na Heamon, site n'ugwu Miza.
Nyochaa ABÙ ỌMA 42:6
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị