Ihe ndia ka m'gēcheta, wusi kwa nkpu tu-obim nimem dika miri, Otú m'nāgabiga n'etiti ìgwè madu, nējere ha nwayọ dika onye-ndú-ha rue ulo Chineke, N'olu iti-nkpu-ọṅù na nke ekele, bú ìgwè madu nēme ememe. Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ N'ihi nzọputa nile nke iru-Ya. Chinekem, nimem ka nkpuru-obim nēruda n'ala: N'ihi ya anamecheta Gi site n'ala Jọdan, Site kwa na Heamon, site n'ugwu Miza. Ob͕u-miri nākpọ ob͕u-miri òkù n'olu nrùda-miri nile nke Gi: Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile agabigawo n'isim. N'ehihie Jehova gēnye ebere-Ya iwu, N'abali kwa ka abù-Ya gādi n'onum, Bú ekpere m'nēkpere Chineke nke ndum. Ka m'si Chineke, bú nkumem di elu, N'ìhi gini ka I chezọworom? N'ìhi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro? Dika asi na eji ihe gwepia ọkpukpum nile, ndi nākpab͕um nātam uta; Mb͕e ha nāsin ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ? Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'agēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.
Gụọ ABÙ ỌMA 42
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 42
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 42:4-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị