Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù:
Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha.
Jide ọta na ọta uku,
Bilie iyerem aka.
Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum:
Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu.
Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike:
Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.
Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe,
Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.
Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ,
Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha.
N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha,
Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim.
Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi;
Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya:
Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.
Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova:
Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.
Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi?
Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya,
I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.
Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili;
Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum.
Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,
Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.
Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe:
Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu;
Ekperem nālaghachikute kwa obim.
Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri:
Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.
Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha:
Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi;
Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du:
Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha,
Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.