Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 35

35
Abù Ọma nke Devid.
1Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù:
Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha.
2Jide ọta na ọta uku,
Bilie iyerem aka.
3Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum:
Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu.
4Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike:
Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.
5Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe,
Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.
6Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ,
Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha.
7N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha,
Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim.
8Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi;
Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya:
Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.
9Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova:
Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.
10Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi?
Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya,
I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.
11Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili;
Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum.
12Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,
Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.
13Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe:
Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu;
Ekperem nālaghachikute kwa obim.
14Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri:
Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.
15Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha:
Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi;
Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du:
16Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha,
Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.
17Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya?
Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim,
Si n'aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m'nwere nání ya.
18M'gēkele Gi n'etiti nkpọkọta bara uba:
N'etiti otù ndi nwere ume ka m'gēto Gi.
19Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu:
Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya.
20N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu:
Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala.
21Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem;
Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya.
22I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti:
Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya.
23Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m,
Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem.
24Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem;
Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu.
25Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi:
Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.
26Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim:
Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.
27Ka ha tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa ọṅu, bú ndi ezi omumem nātọ utọ:
Ka ha nāsi kwa mb͕e nile, Jehova di uku, Onye udo orù-Ya nātọ Ya utọ.
28Irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi,
Baye-kwa-ra otuto-Gi ogologo ubọchi nile.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 35: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye