ABÙ ỌMA 35:1-16
ABÙ ỌMA 35:1-16 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù: Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha. Jide ọta na ọta uku, Bilie iyerem aka. Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum: Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu. Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike: Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem. Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha. Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha. N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha, Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim. Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi; Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya: Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya. Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova: Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya. Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi? Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya, I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike. Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili; Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum. Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa. Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe: Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu; Ekperem nālaghachikute kwa obim. Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri: Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe. Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha: Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi; Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du: Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha, Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.
ABÙ ỌMA 35:1-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ; buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha. Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị; bilie bịa nyere m aka. Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. Gwa mkpụrụobi m, “Abụ m nzọpụta gị.” Mee ka ihere mee ndị niile na-agbalịsị ike igbu m. Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ, na ndị ihere mere. Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe, ka mmụọ ozi ONYENWE ANYị bụrụ onye na-achụfu ha. Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị; ka mmụọ ozi ONYENWE ANYị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha, ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m. Ka mbibi bịakwasị ha na mberede, ka ụgbụ ha zobeere m kee ha; ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru. Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na ONYENWE ANYị, ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya. Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị, “O ONYENWE ANYị, ọ bụ onye dịka gị? Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha, ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.” Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m; ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ. Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ. Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa, ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ. Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ; mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m. Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka. Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe, na-atakwara m ikikere eze ha.