M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile:
Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum.
Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi:
Ndi di ume-ala n'obi gānu ya, we ṅuria ọṅu.
Sonum me ka Jehova di uku,
Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n'otù.
Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram,
We naputam n'ujọm nile.
Ha legidere Ya anya, we nwue enwu:
Ka ihere ghara ime kwa ha n'iru.
Onye a ewedara n'ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya,
We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya.
Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya,
Ọ we dọputa ha.
Detunu ire, hu na Jehova di nma:
Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.
Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya:
N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya.
Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha:
Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha.
Bianu, umum, gem nti:
Egwu Jehova ka m'gēzi unu.
Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ,
Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma?
Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ,
chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ.
Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;
Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.
Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume,
Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya.
Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ,
Ibipu ncheta-ha n'uwa.
Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru,
We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha.
Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa,
Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.
Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume:
Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.
Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile:
Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji.
Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua:
Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe.
Jehova nāb͕aputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya:
Agaghi-ama kwa ha ikpe, bú ndi nile nāb͕abà nime Ya.