Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 34:1-22

ABÙ ỌMA 34:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Aga m eto ONYENWE ANYị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. Mkpụrụobi m ga-anya isi na ONYENWE ANYị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. Soro m too ONYENWE ANYị; ka anyị bulie aha ya elu. Nʼihi na etikuru m ONYENWE ANYị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile. Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. Onye ogbenye a kpọkuru ONYENWE ANYị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. Mmụọ ozi ONYENWE ANYị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha. Jiri aka gị tulee ma hụkwa na ONYENWE ANYị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya. Tụọnụ egwu ONYENWE ANYị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya. Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ ONYENWE ANYị. Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu ONYENWE ANYị bụ. Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma, chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha. Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya. Anya ONYENWE ANYị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha; ma ihu ONYENWE ANYị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa. ONYENWE ANYị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. ONYENWE ANYị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ. Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma ONYENWE ANYị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile. Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie. Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ. ONYENWE ANYị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.

ABÙ ỌMA 34:1-22 Bible Nso (IGBOB)

M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile: Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum. Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi: Ndi di ume-ala n'obi gānu ya, we ṅuria ọṅu. Sonum me ka Jehova di uku, Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n'otù. Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram, We naputam n'ujọm nile. Ha legidere Ya anya, we nwue enwu: Ka ihere ghara ime kwa ha n'iru. Onye a ewedara n'ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya, We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya. Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya, Ọ we dọputa ha. Detunu ire, hu na Jehova di nma: Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya. Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya: N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya. Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha: Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha. Bianu, umum, gem nti: Egwu Jehova ka m'gēzi unu. Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ, Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma? Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ, chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya. Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume, Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya. Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ, Ibipu ncheta-ha n'uwa. Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru, We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha. Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha. Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya. Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile: Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji. Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua: Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe. Jehova nāb͕aputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya: Agaghi-ama kwa ha ikpe, bú ndi nile nāb͕abà nime Ya.