Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike:
Ma okwu-Gi ka m'chereworo.
Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike,
Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi?
N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku;
Ma echezọghm ukpuru-Gi nile.
Ùbọchi nke orù-Gi di ole?
Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe?
Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche,
Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di.
Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi:
N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka.
Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa;
Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile.
Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu,
M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi.
Jehova, rue mb͕e ebighi-ebi
Ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe.
Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di:
I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo.
Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta;
N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi.
Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku,
Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam.
Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile:
N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu.
Ọ bu Gi nwem, zọputam;
N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì;
Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche.
Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile;
Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku.
Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya!
Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche.
Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom;
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim.
Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche;
N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche.
Anamaghọta ihe kari ndi-okenye,
N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo.
Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula,
Ka m'we debe okwu-Gi.
Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem;
N'ihi na I zíwom ihe.
Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ!
Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu.
M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe:
N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì.
Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum,
Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm.
Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike,
Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi.
Ewedawom n'ala nke-uku:
Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di.
Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova,
Zíkwam ikpé-Gi nile.
Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile;
Ma echezọghm iwu-Gi.
Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya;
Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia.
Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi;
N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu.
Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile,
Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu.
Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì:
Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.
Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu:
Okwu-Gi ka m'chereworo.
Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ;
Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu.
Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu;
Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem.
Kwaliem elu, ewe zọputam,
M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile.
I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya,
N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu.
I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru:
N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya.
Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi;
Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.