Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu,
Ndi nējeghari n'iwu jehova.
Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu,
Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya.
E, ha emeghi ajọ omume;
N'uzọ-Ya nile ka ha nēje ije.
Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu,
Ka ayi we debesie ha ike.
Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na edoziwo uzọm nile
Idebe ukpuru-Gi nile!
Mb͕e ahu ihere agaghi-emem,
Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di.
M'gēwere obi ziri ezi kele Gi,
Mb͕e m'mutara ikpé nile nke ezí omume-Gi.
Ukpuru-Gi nile ka m'gēdebe:
Arapusilam arapu.
Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha?
Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.
Obim nile ka m'wereworo chọ Gi:
Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.
N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi,
Ka m'we ghara imehie megide Gi.
Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova:
Zím ukpuru-Gi nile.
Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọ
Ikpé nile nke ọnu-Gi.
N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ,
Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile.
N'ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'gātughari uche,
M'gēlegide kwa uzọ-Gi nile anya.
Ihe ukpuru-Gi nile gātọm utọ nke-uku:
M'gaghi-echezọ okwu-Gi.
Meso orù-Gi nke-ọma, ka m'we di ndu;
M'gēdebe kwa okwu-Gi.
Kpughepu anyam abua, ka m'we legide
Oké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta.
Ọbìa ka m'bu n'uwa:
Ezonarilam ihe nile I nyere n'iwu.
Nkpuru-obim etiwawo n'ihi ọchichọ
O ji chọsie ikpé-Gi nile ike mb͕e nile.
I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike,
Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.
Wepu ita-uta na nleda n'arum;
N'ihi na echebewom ihe-àmà-Gi nile.
Ọzọ, ndi-isi nọduru ala kwurita okwu imegidem:
Ma orù-Gi nātughari uche n'ukpuru-Gi nile.
Ọzọ, ihe-àmà-Gi nile bu ihe nātọm utọ nke-uku,
Ha bu ndi nādum ọdu.
Nkpuru-obim nārapara n'ájá:
Dika okwu-Gi si di, me ka m'di ndu.
Akọrọm akukọ uzọm nile, I we zam:
Gi zím ukpuru-Gi nile.
Me ka m'ghọta uzọ nke ihe-iriba-ama-Gi nile:
M'gātughari kwa uche n'oké ọlu-Gi nile.
Nkpuru-obim atupuwo dika miri site n'iru-újú:
Dika okwu-Gi si di, me ka m'guzosie ike.
Wezuga uzọ okwu-ugha n'ebe m'nọ:
Were kwa amara nyem iwu-Gi.
Uzọ nke ikwesi-ntukwasi-obi ka m'rọputaworo:
Ikpé-Gi nile ka m'doworo n'irum.
Araparawom n'aru ihe-àmà-Gi nile:
Jehova, emela ka ihere mem.
N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ,
N'ihi na I gēme ka obim sa mbara.
Jehova, zím uzọ ukpuru-Gi nile:
M'gēchebe kwa ya rue mb͕e ikpe-azu.
Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi;
M'gēwere kwa obim nile debe ya.
Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu;
N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ
Wezuga obim iche ihe-àmà-Gi nile iru,
Ewezuga-kwa-la ya iche urù nēzighi ezi iru.
Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga,
Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile.
Me ka okwu-ọnu-Gi guzosiere orù-Gi ike,
Bú nke diri egwu-Gi.
Me ka ita-utam nke m'nātu ujọ ya gabiga;
N'ihi na ikpé-Gi nile di nma.
Le, achọsiwom ihe-iriba-ama-Gi nile ike:
N'ezi omume-Gi me ka m'di ndu.
Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova,
Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di.
M'gāza kwa onye nātam uta okwu;
N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi.
Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum;
N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo.
M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nile
Rue mb͕e nile ebighi-ebi.
M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara;
N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze,
Ihere agaghi-emekwam.
Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku,
Bú nke m'huworo n'anya.
M'gāchili-kwa-ra ihe nile I nyere n'iwu ọbu-akam, bú ihe nke m'huworo n'anya;
M'gātughari kwa uche n'ukpuru-Gi nile.