Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu, Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya. E, ha emeghi ajọ omume; N'uzọ-Ya nile ka ha nēje ije. Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu, Ka ayi we debesie ha ike. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na edoziwo uzọm nile Idebe ukpuru-Gi nile! Mb͕e ahu ihere agaghi-emem, Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di. M'gēwere obi ziri ezi kele Gi, Mb͕e m'mutara ikpé nile nke ezí omume-Gi. Ukpuru-Gi nile ka m'gēdebe: Arapusilam arapu. Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di. Obim nile ka m'wereworo chọ Gi: Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie. N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi. Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova: Zím ukpuru-Gi nile. Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọ Ikpé nile nke ọnu-Gi. N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ, Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile. N'ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'gātughari uche, M'gēlegide kwa uzọ-Gi nile anya. Ihe ukpuru-Gi nile gātọm utọ nke-uku: M'gaghi-echezọ okwu-Gi.
Gụọ ABÙ ỌMA 119
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 119
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 119:1-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo