O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu; Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri. O zìri otù nwoke iga n'iru ha; Erere Josef ka ọ buru orù: Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike; Nkpuru-obi-ya bàra n'ígwè: Rue mb͕e okwu-Ya rère; Okwu-ọnu Jehova nuchara ya. Eze ziri ozi, we tọpu ya; Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ. O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya, Na onye nāchi ihe nile o nwetara: Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ, Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe. Israel we bata nime Ijipt; Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n'ala Ham. O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku; O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha. Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì, Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ. O zigara Moses, bú orù-Ya, Na Eron onye Ọ rọputara. Ha doro n'etiti ha ihe iriba-ama-Ya nile, Do kwa ihe-ebube di iche iche n'ala Ham. O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie; Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile. Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara, We me ka azù-ha nwua. Ala-ha nuputara awọ, N'ime-ulo nile nke ndi-eze-ha. O kwuru okwu, odudu we bia, Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile. O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé, Na ọku nēnwu enwu n'ala-ha. O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe; Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha. O kwuru okwu, igurube we da, Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu, Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n'ala-ha, Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha. O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha, Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.
Gụọ ABÙ ỌMA 105
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 105
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 105:16-36
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo