ABÙ ỌMA 105:16-36
ABÙ ỌMA 105:16-36 Bible Nso (IGBOB)
O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu; Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri. O zìri otù nwoke iga n'iru ha; Erere Josef ka ọ buru orù: Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike; Nkpuru-obi-ya bàra n'ígwè: Rue mb͕e okwu-Ya rère; Okwu-ọnu Jehova nuchara ya. Eze ziri ozi, we tọpu ya; Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ. O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya, Na onye nāchi ihe nile o nwetara: Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ, Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe. Israel we bata nime Ijipt; Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n'ala Ham. O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku; O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha. Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì, Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ. O zigara Moses, bú orù-Ya, Na Eron onye Ọ rọputara. Ha doro n'etiti ha ihe iriba-ama-Ya nile, Do kwa ihe-ebube di iche iche n'ala Ham. O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie; Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile. Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara, We me ka azù-ha nwua. Ala-ha nuputara awọ, N'ime-ulo nile nke ndi-eze-ha. O kwuru okwu, odudu we bia, Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile. O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé, Na ọku nēnwu enwu n'ala-ha. O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe; Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha. O kwuru okwu, igurube we da, Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu, Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n'ala-ha, Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha. O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha, Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.
ABÙ ỌMA 105:16-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O zitere ụnwụ nʼala ahụ, bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri; o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha, Josef, onye e refuru dịka ohu. Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ, nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu, tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru, tutu ruo mgbe okwu ONYENWE ANYị nwapụtara ya dịka onye eziokwu. Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya. O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere, ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya, na izi ndị okenye ya amamihe. Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa. ONYENWE ANYị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha, ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya. O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara. Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham. O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya. O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara, nke mere ka azụ niile dị nʼime ya nwụsịa. Ala ha niile jupụtara nʼawọ ọ bụladị nʼime ọnụụlọ ndina nke ndị na-achị achị. O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ nta dị iche iche ejupụta nʼala ha niile. Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe nʼala ha niile; o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha, kwatusịakwa osisi niile dị nʼala ha. O kwuru okwu, igurube na ụkpana a na-apụghị ịgụta ọnụ jupụtara ebe niile; ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ, ripịakwa mkpụrụ niile ha kụrụ nʼubi ha. Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha.